2 Ndị Eze 9

Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ.

2 Kings 9:24 (UKJV) And Jehu drew a bow with his full strength, and stroke Jehoram between his arms, and the arrow went out at his heart, and he sunk down in his chariot.

22Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?” Jehu zara, “Olee otu udo ga-esi dịrị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ niile nke ikpere arụsị na mgbaasị nke Jezebel nne gị, jupụtara nʼebe niile.”

23Joram chigharịrị ụgbọ agha ya bido ịgba ọsọ. Mgbe ọ na-agba ọsọ, o tiri mkpu kpọkuo Ahazaya sị ya, “Ahazaya, Aghụghọ dị, ọgbaaghara dị!”

24Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ.

25Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe Onyenwe anyị kwuru okwu amụma a megide ya.

26‘Nʼezie, ahụrụ m ọbara Nebọt na ọbara ụmụ ya ndị ikom ụnyaahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼihi ya, aghaghị m ime ka ị kwụghachi ụgwọ ọbara ha nʼala ubi a.’ Ugbu a, bulie ya tụba ya nʼala ubi a dị ka okwu Onyenwe anyị si dị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.