14Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ ya nʼoge na-adịghị anya.
15Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile.
16Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya.
17Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”
18Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.