19Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.
20Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị.
21Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.