2 Pita 1

Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma,

2 Peter 1:5 (UKJV) And beside this, giving all diligence, add to your faith virtue; and to virtue knowledge;

3O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.

4O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.

5Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma,

6tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi.

7Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.