2 Pita 3

Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

2 Peter 3:18 (UKJV) But grow in grace, and in the knowledge of our Lord and Saviour Jesus Christ. To him be glory both now and for ever. Amen.

16O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi.

17Ya mere, ezi ndị enyi m, ebe unu matara nke a, nọrọnụ na nche ka a ghara isite na njehie ndị na-emebi iwu duhie unu, ime ka unu si nʼọnọdụ unu daa.

18Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.