13Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi.
14Nʼụtụtụ echi ya, Devid degaara Joab akwụkwọ, zighachịkwa ya site nʼaka Ụraya.
15Ihe ọ dere nʼakwụkwọ ahụ bụ nke a, “Tinye Ụraya nʼihu agha ebe ọgụ siri ike. Mgbe ndị iro na-apụkwute unu, laanụ azụ, ma hapụnụ Ụraya nʼihu ọgụ ka ndị iro gbuo ya.”
16Ya mere, mgbe Joab gbara obodo ahụ gburugburu, o tinyere Ụraya nʼebe ọ maara na ndị dị ike nʼetiti ndị iro ha nọ.
17Ndị ikom obodo ahụ pụtara buso Joab agha. Ụfọdụ ndị agha Devid nwụrụ. Ụraya onye Het, so na ndị egburu.