2 Samuel 11

Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ.

2 Samuel 11:23 (UKJV) And the messenger said unto David, Surely the men prevailed against us, and came out unto us into the field, and we were upon them even unto the entering of the gate.

21Onye gburu Abimelek nwa Jeru-Beshet? Ọ bụghị na mgbidi obodo ka nwanyị nọ tụdaa aka nkume dagburu ya na Tebez? Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ nso?’ Ọ bụrụ na ọ jụọ gị ihe dị otu a, gwa ya, ‘Ohu gị bụ Ụraya, onye Het anwụọkwala.’ ”

22Onyeozi ahụ biliri ije, mgbe o rutere, ọ gwara Devid ihe niile Joab ziri ya ka o zie.

23Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ.

24Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.”

25Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.