8Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu.
9Gịnị mere i ji lelịa okwu Onyenwe anyị anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya.
10Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’
11“Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile.
12I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ”