4“Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.”
5Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ!
6Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.”
7Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl.
8Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu.