2 Samuel 14

Eze zara ya, “Enyela onwe gị nsogbu maka nke ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla agwa gị okwu ọbụla, kpọtara m ya. Onye dị otu a agaghị enyekwa gị nsogbu ọzọ.”

2 Samuel 14:10 (UKJV) And the king said, Whoever says ought unto you, bring him to me, and he shall not touch you any more.

8Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.”

9Ma nwanyị ahụ si Tekoa sịrị ya, “Ka onyenwe m, bụ eze, gbaghara mụ na ezinaụlọ m, ka ikpe ọmụma ọbụla ghara ịdịrị eze na ocheeze ya.”

10Eze zara ya, “Enyela onwe gị nsogbu maka nke ahụ. Ọ bụrụ na onye ọbụla agwa gị okwu ọbụla, kpọtara m ya. Onye dị otu a agaghị enyekwa gị nsogbu ọzọ.”

11Mgbe ahụ ọ zara, “Biko, ka eze kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya ka ọ kwụsị onye na-agwa ọchụ, ka ọ ghara igbu onye ọzọ, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke nʼiyi.” Ọ sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, otu agịrị isi agaghị esi nʼisi nwa gị dapụ nʼala.”

12Mgbe ahụ, nwanyị ahụ sịrị, “Biko kwere ka ohu gị nwanyị gwa onyenwe m eze otu mkpụrụ okwu ọzọ.” Ọ sịrị, “Gaa nʼihu kwuo.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.