2 Samuel 16

Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?”

2 Samuel 16:17 (UKJV) And Absalom said to Hushai, Is this your kindness to your friend? why went you not with your friend?

15Ma Absalọm na ndị Izrel abatalarị Jerusalem. Ahitofel sokwa ya.

16Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.”

17Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?”

18Hushaị zara Absalọm sị, “Mba! Onye ahụ Onyenwe anyị na ọha mmadụ na ndị Izrel niile họpụtara, nke onye ahụ ka m ga-abụ. Ọ bụkwa onye ahụ ka m ga-adịnyere.

19Ma onye kwanụ ka m kwesiri ijere ozi? Ọ bụghị nwa eze? Ejeere m nna gị ozi, ugbu a anọkwa m jikere ijere gị ozi!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.