20Absalọm tụgharịrị gwa Ahitofel okwu sị, “Gịnị ọzọ ka m ga-eme? Nye anyị ndụmọdụ gị. Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
21Ahitofel zara, “Ga dinaa ndị iko nwanyị nna gị ndị ahụ ọ hapụrụ ka ha lekọtaa ụlọ. Mgbe ahụ, Izrel niile ga-anụ na ị meela onwe gị ihe na-asọ oyi nʼebe nna gị nọ, aka ndị niile nọnyere gị ga-akwụkwa chịm.”
22Ya mere, ha manyeere Absalọm ụlọ ikwu nʼelu ụlọ; ọ kpọkwaara ndị iko nwanyị nna ya dinaa ha nʼotu nʼotu, nʼihu ndị Izrel niile.
23Nʼoge ahụ, ndụmọdụ ọbụla Ahitofel dụrụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ozi si nʼọnụ Chineke nʼonwe ya bịa. Ọ bụladị nʼebe Devid nọ, na nʼebe Absalọm nọkwa, otu a ka esi bulie ndụmọdụ ọbụla Ahitofel nyere elu.