2 Samuel 18

Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha.

2 Samuel 18:17 (UKJV) And they took Absalom, and cast him into a great pit in the wood, and laid a very great heap of stones upon him: and all Israel fled every one to his tent.

15Ụmụ okorobịa iri ndị na-ebu ihe agha Joab gbara Absalọm gburugburu, tigbuo ya.

16Emesịa, Joab fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha Devid na-achụ ndị Izrel kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na Joab kwụsịrị ha.

17Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha.

18Nʼoge Absalọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na Ndagwurugwu Eze, nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa Ogidi Absalọm ka a na-akpọ ya ruo taa.

19Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk, bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na Onyenwe anyị azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.