24Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya.
25Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa. Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso,
26onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.” Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.”
27Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka Ahimaaz, nwa Zadọk,” Eze zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.”
28Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị Onyenwe anyị Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.”