28Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị Onyenwe anyị Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.”
29Eze jụrụ ya sị, “Oleekwanụ maka nwokorobịa ahụ bụ Absalọm? Ọ nọkwa nʼudo?” Ahimaaz zara sị, “Mgbe Joab zipụrụ ohu eze, na mụ onwe m, oke ụzụ dị, ma amaghị m ihe kpatara ya.”
30Eze gwara ya sị, “Chere nʼebe a.” Ahimaaz chigharịrị chere.
31Mgbe ahụ, onye Kush ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa Onyenwe anyị ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.”
32Eze jụrụ onye Kush ahụ, “Nwokorobịa ahụ bụ Absalọm, ọ nọkwa nʼudo?” Onye Kush ahụ zaghachiri, “Ka ndị iro onyenwe m bụ eze na ndị niile na-ebili imejọ gị dị ka nwokorobịa ahụ!”