9Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.
10Ishboshet nwa Sọl gbara iri afọ anọ mgbe ọ ghọrọ eze ndị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. Ma otu ọ dị, ndị Juda niile nọgidere nʼokpuru Devid.
11Ogologo oge niile Devid chịrị dịka eze ndị Juda na Hebrọn bụ afọ asaa na ọnwa isii.
12Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn.
13Ma Joab, nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu.