2 Samuel 2

Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” Joab sịrị, “Ka ha pụta.”

2 Samuel 2:14 (UKJV) And Abner said to Joab, Let the young men now arise, and play before us. And Joab said, Let them arise.

12Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn.

13Ma Joab, nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu.

14Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” Joab sịrị, “Ka ha pụta.”

15Ha pụtara ka a gụpụtachara ha. Ha dị mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Benjamin na Ishboshet nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Devid.

16Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.