1Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.
2Ọ sịrị: “Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
3Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.