2 Samuel 3

O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl.

2 Samuel 3:6 (UKJV) And it came to pass, while there was war between the house of Saul and the house of David, that Abner made himself strong for the house of Saul.

4Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit. Nke ise bụ Shefataya nwa Abital;

5nke isii bụ Itream, nwa nwoke Egla nwunye Devid. Ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn.

6O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl.

7Ma Sọl nwererịị otu iko nwanyị aha ya bụ Rizpa, nwa Aịa. Ishboshet jụrụ Abna ajụjụ sị, “Gịnị mere gị na iko nwanyị nna m ji dinaa?”

8Iwe were Abna nke ukwuu nʼihi ihe Ishboshet kwuru. Ya mere, ọ zara, “Ọ bụ isi nkịta nke ụlọ Juda ka m bụ? Taa ka m ji obi m niile na-ejere ụlọ nna gị, bụ Sọl, na ezinaụlọ ya, na ndị enyi ya ozi. Ewerebeghị m gị nyefee nʼaka Devid. Ma lee, ugbu a i na-ebo m ebubo ajọ omume nʼihe metụtara nwanyị a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.