9Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.
10Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,
11dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. “ ‘Onyenwe anyị na-ekwupụtara gị, na Onyenwe anyị ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ.
12Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.
13Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ. Aga m eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.