2 Samuel 9

Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.

2 Samuel 9:12 (UKJV) And Mephibosheth had a young son, whose name was Micha. And all that dwelt in the house of Ziba were servants unto Mephibosheth.

10Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ.

11Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze.

12Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.

13Ma Mefiboshet biri na Jerusalem nʼihi na ọ bụ na tebul eze ka ọ na-eri nri mgbe niile. Ọ bụ onye dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.