5Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.
6Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.”
7Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”
8Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?”
9Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere.