1Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna.
2Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola.
3Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi.
4Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.
5Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya?