2 Ndị Tesalonaịka 2

Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya.

2 Thessalonians 2:7 (UKJV) For the mystery of iniquity does already work: only he who now lets will let, until he be taken out of the way.

5Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya?

6Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ihe. Nʼihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru.

7Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya.

8Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya.

9Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.