10Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”
11Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla.
12Anyị na-enye ndị a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, si ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.
13Otu ọ dị ụmụnna, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu.
14Ma ọ bụrụ na ndị ọbụla adịghị erube isi nye ihe anyị kwuru nʼime akwụkwọ ozi a, hụbanụ ndị dị otu a ama ma kwụsịkwa iso ha nwekọ ihe ọbụla, ka ihere mekwa ha.