4Anyị nwere nchekwube nʼime Onyenwe anyị na unu na-eme ma ga-anọgidekwa na-eme ihe niile anyị nyere unu nʼiwu.
5Ka Onyenwe anyị duzie obi unu ịghọta ịhụnanya Chineke ya na ụdị ntachiobi Kraịst nwere.
6Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị.
7Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ.
8O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla.