2 Timoti 1

Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ.

2 Timothy 1:8 (UKJV) Be not you therefore ashamed of the testimony of our Lord, nor of me his prisoner: but be you partaker of the afflictions of the gospel according to the power of God;

6Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi.

7Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.

8Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ.

9Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a.

10Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.