2 Timoti 3

Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ.

2 Timothy 3:1 (UKJV) This know also, that in the last days dangerous times shall come.

1Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ.

2Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha.

3Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.