2 Timoti 3

Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:

2 Timothy 3:16 (UKJV) All scripture is given by inspiration of God, and is profitable for doctrine, for reproof, for correction, for instruction in righteousness:

14Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nʼihe ịmụtara na ihe i kwenyesịrị ike na ya, ebe ị maara onye i si nʼaka ya mụta ha.

15Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs.

16Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:

17ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.