4Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya.
5Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ.
6Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ.
7Ndị a na-akụziri ihe oge niile, ma ha apụghị inweta amamihe nke eziokwu.
8Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosis ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ha bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nʼebe okwukwe anyị dị.