17Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm.
18Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
19Keleere m Prisila na Akwila na ndị niile bi nʼụlọ Onisiferọs.
20Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Melitọs nʼọnọdụ ahụ esighị ike.
21Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo. Yubulọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainọs na Klọdia na ụmụnna anyị niile.