14Ma Pita sịrị, “Mba, Onyenwe m. Ọ dịbeghị mgbe m riri ihe ọbụla rụrụ arụ maọbụ nke na-adịghị ọcha.”
15Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.”
16Ihe a mere ugboro atọ, ngwangwa, e weghachikwara ya nʼeluigwe.
17Mgbe Pita nọ na-atule ihe ọhụ ahụ pụtara bụ nke gbakwara ya gharịị, lee, ndị ikom ahụ Kọnelịọs zipụrụ abịarutela kwụsị nʼọnụ ụzọ, na-ajụ ebe ụlọ Saimọn dị.
18Ha kpọrọ oku ịjụ ma Saimọn onye a na-akpọ Pita ọ nọ nʼụlọ ahụ.