19Ka Pita nọrịị na-atụgharị uche nʼihe ọhụ ahụ pụtara, Mmụọ Nsọ gwara ya, “Lee, mmadụ atọ guzo nʼọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị.
20Bilie, rịda jekwuru ha ngwangwa, enwela obi abụọ ị soro ha gawa, nʼihi na ọ bụ m zitere ha.”
21Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?”
22Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.”
23Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa. Echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ ndị kwere ekwe na Jopa sokwara ya gaa.