29Nʼihi nke a, ọ bụ ya mere m jiri bịa mgbe akpọrọ m na-ajụghị ajụjụ. Ma ka m jụọ ugbu a ihe mere unu ji kpọọ m?”
30Kọnelịọs sịrị, “Nʼụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nʼoge ehihie nʼụlọ m, nʼihe dịka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m nwoke yi uwe na-enwu ọcha ka o guzoro nʼihu m.
31Ọ sịrị, Kọnelịọs, ‘Chineke anụla ekpere gị ma chetakwa onyinye ị na-enye ndị ogbenye.
32Ziga nʼobodo Jopa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. O bi nʼakụkụ osimiri.’ Nʼebe ahụ ha ga-ahụkwa otu onye ọbịa aha ya bụ Saimọn a na-akpọ Pita.
33Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji mee ngwangwa zie ka a kpọọ gị. Ọ dị mma na ị bịara. Ugbu a, anyị niile ezukọtala nʼebe a nʼihu Chineke ịnụrụ ihe niile Onyenwe anyị chọrọ ka ị gwa anyị.”