39“Anyị bụ ndị akaebe ihe niile o mere nʼala ndị Juu na nʼime Jerusalem. Ha gburu ya site nʼịkpọgide ya nʼelu obe.
40Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ndị mmadụ hụ ya anya.
41Ọ bụghị mmadụ niile kama ọ bụ naanị anyị ndị Chineke họpụtara, dịka ndị akaebe, ndị soro ya rie ma ṅụọkwa mgbe o si nʼọnwụ bilie.
42O nyere anyị iwu ka anyị gaa zisaa oziọma nʼebe niile, ịkọwa na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ịbụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
43Ndị amụma niile gbara ama ihe banyere ya na onye ọbụla nke kweere na ya ga-enweta mgbaghara mmehie site nʼaha ya.”