10Nke a mere ugboro atọ, ma emesịa dọlie ha niile laa nʼeluigwe.
11“Nʼotu oge ahụ, ndị ikom atọ ndị e zipụrụ site Sizaria ịkpọ m bịarutere kwụsị nʼọnụ ụzọ nʼụlọ ebe m nọ.
12Mmụọ Nsọ gwara m ka m ghara inwe obi abụọ isoro ha na-akpaghị oke ọbụla. Mmadụ isii ndị a nʼetiti ụmụnna anyị sokwa m, bịarute nʼụlọ nwoke ahụ.
13Ọ gwara anyị otu o si hụ mmụọ ozi nʼụlọ ya, onye sịrị, ‘Ziga ndị ozi jee Jopa ka ha kpọta Saimọn onye a na-akpọ Pita.
14Ọ ga-ewetara gị ozi nke a ga-esite na ya zọpụta gị nʼezinaụlọ gị niile.’