21Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị.
22Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk.
23Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị.
24Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị.
25Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl.