Ọrụ Ndị Ozi 12

Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya.

Acts 12:10 (UKJV) When they were past the first and the second ward, they came unto the iron gate that leads unto the city; which opened to them of his own accord: and they went out, and passed on through one street; and forthwith the angel departed from him.

8Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.”

9Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie.

10Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya.

11Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”

12Mgbe ọ ghọtara ihe merenụ, ọ gawara nʼụlọ Meri nne Jọn onye a na-akpọkwa Mak, ebe ọtụtụ mmadụ zukọtararị na-ekpe ekpere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.