11Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”
12Mgbe ọ ghọtara ihe merenụ, ọ gawara nʼụlọ Meri nne Jọn onye a na-akpọkwa Mak, ebe ọtụtụ mmadụ zukọtararị na-ekpe ekpere.
13Mgbe ọ kụrụ aka nʼọnụ ụzọ ama, otu odibo nwanyị aha ya bụ Roda bịara ka o zaa ya.
14Mgbe ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ juru ya obi nke mere na ọ gbaara ọsọ laghachi azụ nʼemegheghị ụzọ. Ọ gara tisaa, “Ọ bụ Pita nọ nʼọnụ ụzọ!”
15Ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dịka onye uche ya na-ezughị oke. Mgbe ọ nọgidesịrị ike na-ekwu otu ihe ahụ, ha sịrị, “Ọ ghaghị ị bụ mmụọ ozi ya.”