14Mgbe ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ juru ya obi nke mere na ọ gbaara ọsọ laghachi azụ nʼemegheghị ụzọ. Ọ gara tisaa, “Ọ bụ Pita nọ nʼọnụ ụzọ!”
15Ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dịka onye uche ya na-ezughị oke. Mgbe ọ nọgidesịrị ike na-ekwu otu ihe ahụ, ha sịrị, “Ọ ghaghị ị bụ mmụọ ozi ya.”
16Ma Pita nọgidere na-akụ aka nʼụzọ. Mgbe ha meghere ụzọ hụ ya, ọ gbagwojuru ha anya.
17O feere ha aka ka ha mechie ọnụ. Ọ kọọrọ ha otu Onyenwe anyị si dupụta ya site nʼụlọ mkpọrọ. Ọ gwara ha, “Meenụ ka Jemis na ụmụnna anyị niile mata ihe ndị a.” Ọ pụrụ gawa ebe ọzọ.
18Nʼisi ụtụtụ echi ya, oke ọgbaaghara dị nʼetiti ndị agha, ebe ha na-eche ihe mere Pita.