17O feere ha aka ka ha mechie ọnụ. Ọ kọọrọ ha otu Onyenwe anyị si dupụta ya site nʼụlọ mkpọrọ. Ọ gwara ha, “Meenụ ka Jemis na ụmụnna anyị niile mata ihe ndị a.” Ọ pụrụ gawa ebe ọzọ.
18Nʼisi ụtụtụ echi ya, oke ọgbaaghara dị nʼetiti ndị agha, ebe ha na-eche ihe mere Pita.
19Mgbe Herọd chọgharịchara ya ma ọ chọtaghị ya, ọ jụrụ ndị nche ahụ ajụjụ dị iche iche. Nʼikpeazụ ọ nyere iwu ka e gbuo ha. Emesịa ọ hapụrụ Judịa gaa Sizaria nọdụ nʼebe ahụ.
20Nʼoge ahụ Herọd na-eweso ndị Taịa na Saịdọn iwe, ha zipụrụ ndị ozi ha izute ya. Ha buru ụzọ mee ka ha na Blastọs bụrụ enyi, onye eze tụkwasịrị obi nke na-elekọtakwa ime ụlọ ndina eze anya. Ha rịọrọ ya ka udo dịrị, nʼihi na a na-esi nʼobodo eze na-enwetara ha ihe oriri.
21Nʼụbọchị nzukọ ahụ, Herọd gbokwasịrị uwe ndị eze ya nọkwasị nʼocheeze ya. O weere oke olu dị iche gwa nzukọ ahụ niile okwu.