Ọrụ Ndị Ozi 12

Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya.

Acts 12:7 (UKJV) And, behold, the angel of the Lord came upon him, and a light shined in the prison: and he stroke Peter on the side, and raised him up, saying, Arise up quickly. And his chains fell off from his hands.

5Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke.

6Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.

7Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya.

8Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.”

9Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.