10sị, “Gị nwa ekwensu, jupụtara nʼaghụghọ na nʼihe ọjọọ dị iche iche. Gị onye iro nke ezi omume niile. Ọ bụ na i gaghị akwụsị imerụ ụzọ niile ziri ezi nke Onyenwe anyị?
11Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.” Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya.
12Mgbe onyeisi ahụ hụrụ ihe mere, o kweere, nʼihi na o juru ya anya bụ ozizi nke okwu Onyenwe anyị.
13Pọl na ndị otu ya ji ụgbọ mmiri site na Pafọs garuo Pega nke dị nʼala Pamfilia. Nʼebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem.
14Site na Pega ha gara ruo Antiọk obodo nke dị na Pisidia. Nʼụbọchị izuike, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala.