26“Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile.
27Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ.
28Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya.
29Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya.
30Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie.