50Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ.
51Ha tichapụrụ aja dị nʼụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka na ntị mmegide ha. Ha hapụrụ obodo ahụ gaa Aikoniọm.
52Ma ndị na-eso ụzọ ya jupụtakwara nʼọṅụ na nʼike nke Mmụọ Nsọ.