9O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya,
10were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije.
11Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.”
12Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu.
13Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha.