Ọrụ Ndị Ozi 14

Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk.

Acts 14:21 (UKJV) And when they had preached the gospel to that city, and had taught many, they returned again to Lystra, and to Iconium, and Antioch,

19Ma ndị Juu sitere nʼAntiọk na Aikoniọm bịara kpalie obi igwe mmadụ ahụ. Nʼihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya pụọ nʼobodo, chee na ọ nwụọla.

20Ma mgbe ndị na-eso ụzọ bịara gbaa ya gburugburu, o bilitere, laghachikwa nʼime obodo ahụ. Ma nʼechi ya, ya na Banabas sooro gaa Debi.

21Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk.

22Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.”

23Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.