1Nʼobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nʼụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu nʼụzọ pụrụ iche nke mere nʼọtụtụ mmadụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ kwenyekwara.
2Ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu ahụ, kpaliri ndị mba ọzọ mee ka mkpụrụobi ha jọọ njọ megide ụmụnna.
3Otu ọ dị, ha nọgidere nʼebe ahụ ogologo oge, na-ekwusakwa okwu nke Onyenwe anyị na-atụghị egwu ọbụla. Onye nke gosikwara na ọ bụ okwu amara ya ka ha na-ekwu site nʼinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche.
4Ma ndị obodo ahụ kewara abụọ, ụfọdụ nʼime ha dịnyere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyekwara ndị ozi.
5Mgbe ndị mba ọzọ, na ndị Juu, ha na ndị ndu ha, gbara izu ime ha ihe ihere, tụọkwa ha nkume.