Ọrụ Ndị Ozi 14

Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla.

Acts 14:8 (UKJV) And there sat a certain man at Lystra, impotent in his feet, being a cripple from his mother's womb, who never had walked:

6Ndị ozi ahụ matara nzube ha site nʼebe ahụ gbapụ ọsọ gbaruo nʼakụkụ Laikonia, gbaba nʼime obodo Listra na Debi na obodo nta ndị ọzọ ndị dị nʼakụkụ ebe ahụ.

7Nʼebe ahụ, ha gara nʼihu na-ekwusakwa oziọma ahụ.

8Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla.

9O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya,

10were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.