Ọrụ Ndị Ozi 15

Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a.

Acts 15:27 (UKJV) We have sent therefore Judas and Silas, who shall also tell you the same things by mouth.

25Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas,

26ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

27Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a.

28Nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi nʼanya Mmụọ Nsọ na nʼanya anyị kwa, na o kwesighị ka anyị bokwasị unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa.

29Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.